Wikikwuótu:Shesaid 2024 nke otu ndị Igbo


Ọ bụ Wiki in Africa na-ebute atụmatụ #SheSaid, nke bụ akụkụ nke ọrụ Wiki Loves Women (WLW). Ihe ejieme #shesaid kwa afọ bu maka ndị mba uwa ịmata ụmụnwaanyị na-agba ume n'oge niile site n'ilekwasị anya n'ịdepụta, ntụgharị na imeziwanye ọnụnọ ha na Wikiquote Igbo, Wikipedia Igbo, na Wikidata. Site n'ime nke a, ọ na-achọ imechi ọdịiche dị n'etiti nwoke na nwanyị na ọrụ Wiki, hụkwa na edeputara nke ọma ihe ha rụpụtara ma ịnụ olu ụmụ nwanyị na gburugburu ụwa. Site na #SheSaid, ndị niile na-agbakota mbọ iji ịkwalite ntọala ihe ọmụma mepere emepe dị iche iche yana nsonye. N'oge #Shesaid nke afọ 2023 na otu ndị Igbo, a denyere peeji 1,320 na Wikiquote Igbo site n'aka mmadụ iri anọ na isii/ ndi nyere aka. Asọmpi Shesaid ndị Igbo nke afo 2022 nke a mere n'izu uka abụọ, mkpokọtara ndị ọhụrụ na ndị ochie ndị mepụtara ihe. Ndị ntinye aka mepụtara nke ọma peeji 472 dị ọhụrụ na Wikikwuotu Igbo

WLWː SheSaid, Nye ya olu

    Sonye anyi

    dezie

    Nzọụkwụ ị ga-eme mgbe ị na-etinye aka na Wikiquote igbo bụ:

    • Debanye aha ọ bụrụ n' ibu onye ọhụrụ
    • Jiri ndepụta ihe a ga-eme ka imepụta ibe ma ọ bụ chọọ nhota ndị inyom ama ama. Ekwesịrị ị nweta nkwupụta sitere na isi mmalite ndị a pụrụ ịdabere na ya, ya bụ saịtị akụkọ, akwụkwọ, akwụkwọ akụkọ, akwụkwọ akụkọ, wdg. Cheta ịdenyekwa edensibia.
    • Soro n'oge mmalite asọmpi a wee jiri akụrụngwa enyere mụta ihe.
    • Tụgharịa okwu ha kwuru n'asụsụ Igbo ma hụkwa na enwere obere akụkọ ndụ gbasara nwanyị ị na-atụgharị.
    • Cheta idenye hashtag #SheSaid na nchịkọta ndezie gị ka anyị nwee ike ịhụ ya.
    • Denye njikọ mpuga na ụdi peeji i deputara

    Oge a ga-eme ya

    dezie
    • Ụbọchị mmalite: 02 Ọktoba, 2024
    • Ụbọchị Asọmpi: Ọnwa Iri na Abụọ 2-30, 2024
    • Ebe: Na interneeti

    Ndepụta ihe a ga-eme

    dezie
    • Ndepụta ntụgharị asụsụ Wikiquote
    • Ndepụta ntụgharị asụsụ Wikipedia
    • Wikidata
    • Maka Wikidata ị nwere ike ịmepụta ihe maka onye ama ama ma ọ bụ jiri ndepụta ihe a ga-eme nke Wikipedia imelite ihe site na itinye nkọwa n'asụsụ Igbo, tinye edensibia, foto, ma ọ bụ nkọwa ndị ọzọ gbasara isiokwu ahụ.

    Ihe emepụtara

    dezie

    A ga-edenye ya n'oge na-adịghị anya

    Hukwa

    dezie