Leymah Gbowee
Onye na-akwado udo Liberia
Roberta Gbowee (amuru 1 Febụwarị 1972) bụ onye na-akwado udo Liberia nwere ọrụ maka idu otu ndị inyom na-adịghị eme ihe ike, Women of Liberia Mass Action for Peace nke nyere aka weta njedebe Agha obodo Laịberịa nke abụọ na 2003.
Ihe ndị ọ kwụrụ
dezie- Ọchịchị bụ ịguzoro ndị gị. Ndị mmadụ na-ekwu na ị ga-adị ndụ ịlụ ọgụ ụbọchị ọzọ, mana mgbe ụfọdụ ị ga-egosi na ị bụ ezigbo onye ndu.
- A na m eme njem ugbu a iji mezuo ọchịchọ, n'obere ikike m, nke ụmụ agbọghọ Africa.
- Onwere ihe n'uwa a nke onye obula nwere ike ime. Chineke kere anyị niile ma nye anyi ihe pụrụ iche iji nye onyinye.
- Otu ihe m na-atụtụbeghị ụjọ bụ iguzo n’ihu ndị dị ukwu ikwuputa uche m. M na-anọchite anya ụmụ nwanyị ndị nwere ike ha gaghị enwe ohere ịga UN ma ọ bụ izute onyeisi oche. Anaghị m atụ egwu ikwu eziokwu nye ọchịchị.
- Ana m agwa ndị mmadụ, iwe dị mmiri mmiri. Ọ na soputa a soputa, ọ dị ka mmiri. Ị tinye ya n'ime akpa ọ ga ewere ọdịdị nke akpa ahụ. Ọtụtụ ndị ị na-ahụ n’ụlọ mkpọrọ na-ebuso ndị ha agha, iwe na-ewe ha, ha were iwe were tinye ya n’ime akpa ihe ike.
- Ọ bụrụ na ị na-ekpe ikpe ziri ezi nye otu onye, ndị ahụ emetụtara kwesịkwara ikpe ikpe ziri ezi.
- Mgbe m dị afọ iri ba asaa, oge mbụ m hụrụ ozu nwụrụ anwụ, ahụ jụrụ m oyi. Ka ọ na-erule afọ iri atọ na otu ọ bụụrụ m ihe ndapụta, ọ nweghịkwa otu mmadụ kwesịrị ibi ụdị ndụ ahụ.
- M bụ ezigbo nchekwube. M si na obodo ebe ị nwere ntakịrị ihe ị ga-atụ anya ya, yabụ ị ga-abụ onye nwere nchekwube mgbe niile.
- Abịawo m n'otu nkwubi okwu: Ihe niile m bụ, ihe niile na-achọsi ike ịbụ, ihe niile m bụbu, bụ site n'amara nke Chineke. Enwere ọtụtụ ụmụ nwanyị na Africa, na n'èzí Africa, ndị nwere ọgụgụ isi karịa m.