Joy Ezeilo
Onye Ọkaiwu Naijiria
Joy Ezeilo
Joy Ngozi Ezeilo bụ ọkankuzi na-ahụ maka iwu banyere ọha nà Naịjirịa na onye òtù United Nations pụrụ iche na-ahụ maka azụmahịa mmadụ n'Afrịka afọ isii. Ọ bụbu kọmishọna na-ahụ maka okike na mmepe mmekọrịta mmadụ na ibe ya, n'Enugwu steeti, onye isi nkwado iwu na Naijiria na onye na-akwado ọrụ. Ọ bụbu Dean na onye isi fakụlti law nà University of Nigeria Nsukka na onye guzobere Women Aid Collective (WACOL). Ọ nnatara akaraugo Officer of the Order of Niger (OON) mà bụrụkwa otu n'ime ụmụ nwaanyị 2022 BBC 100 Women.
Ihe o kwuru
dezie- Anaghị m ekwu na ụmụ nwoke abụghị ndị a na-eme ihe ike n’ụzọ mmekọahụ, a na-erekwa ụmụ nwoke mana ọ kà emetụta ụmụ nwanyị na ụmụ agbọghọ. Nke a bụ n'ihi ọnọdụ ha n'obodo nakwa n'ezinụlọ adịghị mbụ sie ike. Ihe ọha na-atụ anya, usoro dị n'obodo, mmekọrịta ike, ọdịiche dị n'ezi na ime ụlọ. I lee ihe ndị a niile anya, ị ga-ahụ na ọ bụ ha nọ n’ọnọdụ ka njọ. Mgbe ị chọrọ inye aka, ị ga-amalite site n'inyere ndị a kacha emegbu emegbu aka. Ihe kacha mma bụ na ọ dịghị onye kwesịrị ịta ahụhụ maọbu kwesịrị ka a napụ ya ihe ndị ruru ya dịka mmadụ, mana ị ga-amalite site na ndị na-akachaghị nwe nchekws ma ọ bụ ndị ọ ga-aka emetụta.