Chinedum Peace Babalola

Chinedum Peace Babalola (amụrụ n'ezinụlọ Anyabuike) FAS, FAAS bụ onye Ọkammụta Naijiria na ngalaba Pharmaceutical Chemistry and Pharmacokinetics. Ọ bụ ọkammụta nwanyị mbụ na ngalaba imepụta na ire ọgwụ na Mahadum Ibadan FAS na FAAS na nwanyị nke abụọ enwere na Naijiria nwe nzere FAAS. Ọ bụ ya bụ onye isi Mahadum Chrisland ugbua.

Ihe Ndi O Kwuru dezie

  • Anaghị m atụ anya na nwanyị ọbụla maọbụ nwa agbọghọ ọbụla ga-eme mkpesa na anaghị enye ya ohere n'ihi na enwere ọtụtụ ohere nye ụmụ agbọghọ na ụmụ nwanyị niile nọ n'ụwa ka anyị na-ekwu; naanị ihe anyị kwesịrị ime bụ ịchọpụta ohere ndị a ma were ya mee ihe.
    • [1] Chinedum n'okwu okwuru N'ajụjụ ọnụ agbara ya.
  • Ọ ga-ekwe omume ime ka ọhụụ gị bụrụ ihe dị ìrè. Inwe onye ndụmọdụ dịkwa oke mkpa. Nweekwa onye nlereanya. Mụọ onye nlereanya gị; mụta ihe n'aka ya, ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị.
    • [2] Chinedum n'okwu okwuru N'ajụjụ ọnụ agbara ya.
  • Echetara m ka m siri gbanarị ya na 100 Level na mahadum Ife (nke bụzi Obafemi Awolowo University ugbua). Anyị amaralarị maka ya tupu m abanye mahadum ahụ mana m gbaziri ọsọ ndụ m m hụrụ n'anya mgbe nchọpụtara na ndị nkuzi abụọ n'akụziri anyị Fiziks na Kemịstrị wụgidere m anya n'ahụ. Echetara m na onwere ótù mgbè ótù n'ime ndị enyi ọkpụ aka m nwekwara nsogbu nke ya, nke mere ka anyị gaa n'ìgwè dịka ụmụ akwụkwọ ịrịọ onye nkuzi ahụ ka ọ hapụ ya.
    • [3] N'ajụjụ ọnụ ndị Punch gbara ya (June 30, 2019).

Njikọ Mpụga dezie

 
Wikipedia
Wikipedia nwèrè edemede màkà: