Adenike Osofisan
Adenike Osofisan
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Adenike |
aha ezinụlọ ya | Osofisan |
ụbọchị ọmụmụ ya | 11 Maachị 1950 |
Ebe ọmụmụ | Osogbo |
Asụsụ obodo | Asụsụ Yoruba |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | academic, university teacher |
onye were ọrụ | University of Ibadan |
ebe agụmakwụkwọ | Obafemi Awolowo University, Georgia Tech, University of Ibadan |
onye ndụmọdụ doctoral | Adebayo Dada Akinde |
doctoral student | Bamidele Ayodeji Oluwade, Babatunde Opeoluwa Akinkunmi |
Academia.edu profile URL | https://ibadan.academia.edu/AdenikeOsofisan |
Adenike Osofisan (amụrụ 11 Maachị 1950) bụ ọkammụta sayensị Kọmputa nke ala Naijiria, onye bụ ọkachamara na ngwuputa data na njikwa ihe ọmụma. Ọ bụ ya bụ nwanyị Naijiria mbụ nwetara nzere Ph.D. na Kọmputa Sayensị, ógó O rururịị n'afọ 1989. N'afọ 2006, ọ ghọrọ onye ọkammụta zuru oke na mahadum nke Ibadan, mbuli elu mere ya ka ọ bụrụ nwanyị Afrịka mbụ ghọrọ ọkammụta sayensị Kọmputa.
Okwu Ndị O Kwuru
dezie- Enwere ọtụtụ ihe na-eme ka ụlọ akwụkwọ Lord's Schools bụrụ ọpụrụiche. Ha na-enye ụmụ akwụkwọ ha ọzụzụ zuru oke ma na-akụziri ha ịtụ egwu Jehova. Ha na-azụ ụmụaka ka ha bụrụ ezigbo ụmụ amaala Naịjirịa. Ha nwekwara ebe a na-azụ ehi, ebe a na-azụ ọkụkọ, ubi, na ndị ọzọ.
- [1] Ọkammụta Adenike n'okwu O kwuru maka ụlọ akwụkwọ Lord's Schools n'afọ 2019.
- Gbasara Kudirat kwa, dike nwanyị nke ochichi onye kwuo uche ya, enwere m obi uto nke ukwuu na a na-asọpụrụ m tinyere ndi dike abuo ahu. Enwere m mpako maka ya.
- [2] Ọkammụta Osofisan na mkparịtaụka O mere maka nkwanye ugwu akwanyeere ya n'afọ 2019.
- Ọtụtụ ndị mmadụ na-aghọtahie ya. Akụrụngwa ndị e nwere taa karịrị ndị e nwere n’oge anyị. N'oge anyị, ihe ọmụmụ General Science ka ewepụtara naanị n'afọ ikpeazụ anyị. Otú ọ dị, taa, ọbụna site na ụlọ akwụkwọ praịmarị, a na-ekpughere ụmụaka ọmụmụ kọmputa, sayensị na ihe ndị yiri ya.
- [3] Ọkammụta Adenike mgbe ọ n'atule ógó ọmụmụ akwụkwọ mgbe nke ha na ugbua n'afọ 2019.
- Amaghị m. Ma kaosinadị, enwere m obi ụtọ. Ị maara ụdị mmetụta ahụ, mmetụta abụọ dị iche iche. Enwere m nnọọ obi ụtọ na ọñụ. N'otu oge ahụ, ọ dị m nnọọ ka ọ bụrụ na papa m ka dị ndụ ịgba àmà ya.
- [4] Ọkammụta Adenike mgbe ọ na-ekwuputa ụdị mmetụta o nwere mgbe enyere ya nturu ugo idebanye aha ya na Nigerian Women Hall of Fame n'afọ 2019.
- Akpọrọ m nwanyị ígwè maka na m bụ nwanyị ihe na-agara nke ọma
- [5] Ọkammụta Osofisan n'akwụkwọ mgbasa ozi Punch News n'afọ 2019.
- Enweghị ihe nkepụta ọhụrụ ọbụla na anaghị eweta mma na njọ. Otú ọ dị, ọ dabeere na akụkụ nke ị chọrọ iwere
- [6] Ọkammụta Adenike on n'okwu ya maka ihe nlụpụta ọ̀gbọ́ nzikọrita ozi soshal midia n'izulite ụmụaka n'afọ 2019.
- Ịzụ nwa akwụkwọ n'ógó mahadum bụ nnukwu ego. Anyị na-eji agụmakwụkwọ na-egwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ukwuu, ma ọ bụrụhaala na ị na-eji agụmakwụkwọ egwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ihe agaghị aga nke ọma. Nke ahụ bụ eziokwu.
- [7] Ọkammụta Adenike na ndụmọdụ o nyèrè maka ịkwalite agụmakwụkwọ n'afọ 2019.
Njikọ Mpụga
dezie- Adenike Osofisan na Wikikwuotu bekee
- Adenike Osofisan na Wikipidia Igbo